Psalms 109

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma Devid.

Ntamu nʼoge nsogbu

1O Chineke, onye m na-eto,
anọgidekwala na-agba nkịtị,
2nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ
emegheela ọnụ ha megide m;
ha aghaala ụgha megide m.
3Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu;
na-ebuso m agha nʼefu.
4Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo
ma abụ m nwoke onye ekpere.
5Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere,
ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya.

6Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya;
ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya.
7Mgbe a ga-ekpe ya ikpe, ka ọ bụrụ onye ikpe mara,
ka ekpere ya maa ya ikpe ọnwụ.
8Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole,
ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya.
9Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna,
ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di.
10Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi,
ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ.
11Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere,
ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya.
12Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma;
ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere.
13Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa,
ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.
14Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha,
ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya.
15Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile;
ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.

16Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere,
ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa
na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ.
17Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya,
ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya;
ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla,
ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ.
18O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya;
ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri,
bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ.
19Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa,
dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi.
20 Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata,
bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.

21Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị
nyere m aka nʼihi aha gị,
site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m.
22Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa,
obi m tiwakwara etiwa nʼime m.
23Ana m efu
Maọbụ, agba barịị
dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara;
adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ.
24Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ;
ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ.
25Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo,
mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha.

26Nyere m aka, o Onyenwe anyị Chineke m;
zọpụta m dịka ịhụnanya gị si dị.
27Ka ha mara na ọ bụ aka gị,
na ọ bụ gị, o Onyenwe anyị, mere ya.
28Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi;
mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere,
ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ.
29A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe
werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda.

30Aga m eji ọnụ m jaa Onyenwe anyị mma nke ukwuu;
nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya.
31Nʼihi na ọ na-eguzo nʼaka nri nke onye nọ na mkpa,
ịzọpụta ya site nʼaka ndị na-ama ya ikpe ọnwụ.
Copyright information for IboBIU